Native Bible

Psalms 71:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

Psalms 71:8 in English

Psalms 71:8 · Berean Standard Bible

My mouth is filled with Your praise and with Your splendor all day long.

Context

6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị. 7Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike. 8Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile. 9Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m. 10Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.