Abụ Ọma 71:3
Psalms 71:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
Psalms 71:3 in English
Psalms 71:3 · Berean Standard Bible
Be my rock of refuge, where I can always go. Give the command to save me, for You are my rock and my fortress.
Context
1Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere mee m. 2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;
tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m. 3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;
nye iwu maka nzọpụta m,
nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. 4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,
ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. 5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,
ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.