Native Bible

Psalms 73:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.

Psalms 73:6 in English

Psalms 73:6 · Berean Standard Bible

Therefore pride is their necklace; a garment of violence covers them.

Context

4Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike. 5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere. 6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe. 7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta. 8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.