Proverbs 28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,
ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm. 2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge. 3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị. 4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha. 5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya. 6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu
karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ. 7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,
ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere. 8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,
na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere. 9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,
ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ. 10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,
ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,
ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa. 11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,
ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya. 12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,
ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu. 13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.
Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere. 14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,
ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu. 15Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ
otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị. 16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;
ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị. 17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe
ruo ala mmụọ.
Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka. 18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,
ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu. 19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. 20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. 21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. 22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya. 23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ. 24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,
“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”
Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi. 25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,
ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu. 26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!
Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha. 27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.
Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.* 28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,
ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.
28:27 Dit 15:7; Ilu 22:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.