Ilu 28:1
Proverbs 28:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
Proverbs 28:1 in English
Proverbs 28:1 · Berean Standard Bible
The wicked flee when no one pursues, but the righteous are as bold as a lion.
Context
1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,
ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm. 2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge. 3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.