Ilu 28:2
Proverbs 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
Proverbs 28:2 in English
Proverbs 28:2 · Berean Standard Bible
A land in rebellion has many rulers, but a man of understanding and knowledge maintains order.
Context
1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,
ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm. 2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge. 3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị. 4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.