Ilu 28:4
Proverbs 28:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
Proverbs 28:4 in English
Proverbs 28:4 · Berean Standard Bible
Those who forsake the law praise the wicked, but those who keep the law resist them.
Context
2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge. 3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị. 4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha. 5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya. 6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu
karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.