Ilu 28:5
Proverbs 28:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
Proverbs 28:5 in English
Proverbs 28:5 · Berean Standard Bible
Evil men do not understand justice, but those who seek the LORD comprehend fully.
Context
3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị. 4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha. 5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya. 6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu
karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ. 7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,
ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.