Ilu 28:25
Proverbs 28:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
Proverbs 28:25 in English
Proverbs 28:25 · Berean Standard Bible
A greedy man stirs up strife, but he who trusts in the LORD will prosper.
Context
23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ. 24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,
“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”
Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi. 25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,
ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu. 26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!
Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha. 27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.
Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.