Ilu 28:23
Proverbs 28:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
Proverbs 28:23 in English
Proverbs 28:23 · Berean Standard Bible
He who rebukes a man will later find more favor than one who flatters with his tongue.
Context
21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. 22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya. 23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ. 24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,
“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”
Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi. 25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,
ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.