Ilu 28:21
Proverbs 28:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
Proverbs 28:21 in English
Proverbs 28:21 · Berean Standard Bible
To show partiality is not good, yet a man will do wrong for a piece of bread.
Context
19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. 20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. 21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. 22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya. 23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.