Native Bible

Proverbs 28:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.

Proverbs 28:20 in English

Proverbs 28:20 · Berean Standard Bible

A faithful man will abound with blessings, but one eager to be rich will not go unpunished.

Context

18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu. 19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. 20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. 21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. 22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.