Ilu 28:20
Proverbs 28:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
Proverbs 28:20 in English
Proverbs 28:20 · Berean Standard Bible
A faithful man will abound with blessings, but one eager to be rich will not go unpunished.
Context
18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,
ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu. 19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. 20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ. 21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri. 22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.