Ilu 28:18
Proverbs 28:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
Proverbs 28:18 in English
Proverbs 28:18 · Berean Standard Bible
He who walks with integrity will be kept safe, but whoever is perverse in his ways will suddenly fall.
Context
16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;
ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị. 17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe
ruo ala mmụọ.
Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka. 18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,
ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu. 19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ. 20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.