Native Bible

Proverbs 28:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.

Proverbs 28:26 in English

Proverbs 28:26 · Berean Standard Bible

He who trusts in himself is a fool, but one who walks in wisdom will be safe.

Context

24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi. 25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu. 26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha. 27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.* 28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba. 28:27 Dit 15:7; Ilu 22:9

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.