Proverbs 29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,
nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ. 2Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,
ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị. 3Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,
ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi. 4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,
ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi. 5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma
bụ ọnya ka ọ na-esiri ya. 6Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama.
Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ. 7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,
ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi. 8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,
ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị. 9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,
onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị. 10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,
ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi. 11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,
ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ. 12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,
ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume. 13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:
ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ. 14Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe,
a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,
ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere. 16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,
ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha. 17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.
Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị. 18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,
ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,
nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ. 20Olileanya dịrị onye nzuzu
karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu. 21Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi,
ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị. 22Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ,
onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie. 23Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa,
ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ. 24Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha,
a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe. 25Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya,
ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo. 26Ị chọrọ ikpe ziri ezi?
Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya. 27Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị;
ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.