Native Bible

Proverbs 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.

Proverbs 29:7 in English

Proverbs 29:7 · Berean Standard Bible

The righteous consider the cause of the poor, but the wicked have no regard for such concerns.

Context

5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya. 6Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ. 7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi. 8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị. 9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.