Ilu 29:9
Proverbs 29:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
Proverbs 29:9 in English
Proverbs 29:9 · Berean Standard Bible
If a wise man goes to court with a fool, there will be raving and laughing with no resolution.
Context
7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,
ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi. 8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,
ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị. 9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,
onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị. 10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,
ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi. 11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,
ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.