Ilu 29:11
Proverbs 29:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
Proverbs 29:11 in English
Proverbs 29:11 · Berean Standard Bible
A fool vents all his anger, but a wise man holds it back.
Context
9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,
onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị. 10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,
ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi. 11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,
ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ. 12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,
ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume. 13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:
ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.