Ilu 29:3
Proverbs 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
Proverbs 29:3 in English
Proverbs 29:3 · Berean Standard Bible
A man who loves wisdom brings joy to his father, but a companion of prostitutes squanders his wealth.
Context
1Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,
nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ. 2Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,
ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị. 3Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,
ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi. 4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,
ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi. 5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma
bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.