Native Bible

Proverbs 29:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

Proverbs 29:18 in English

Proverbs 29:18 · Berean Standard Bible

Where there is no vision, the people cast off restraint; but blessed is he who keeps the Law.

Context

16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha. 17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị. 18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ. 20Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.