Ilu 29:17
Proverbs 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
Proverbs 29:17 in English
Proverbs 29:17 · Berean Standard Bible
Discipline your son, and he will give you rest; he will bring delight to your soul.
Context
15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,
ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere. 16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,
ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha. 17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.
Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị. 18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,
ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,
nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.