Ilu 28:10
Proverbs 28:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
Proverbs 28:10 in English
Proverbs 28:10 · Berean Standard Bible
He who leads the upright along the path of evil will fall into his own pit, but the blameless will inherit what is good.
Context
8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,
na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere. 9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,
ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ. 10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,
ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,
ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa. 11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,
ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya. 12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,
ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.