Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?
Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a? 2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi. 3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe. 4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. 5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,
ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri. 6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume. 7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi. 8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba. 9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe. 10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ. 11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,
ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ. 12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.
Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. 13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
ndị na-amaghị ụzọ ya
maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. 14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;
nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’
ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,
nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. 19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,
otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. 20Akpanwa na-echefu ha,
ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;
anaghị echetakwa ndị ajọọ omume
kama a na-etiji ha dịka osisi. 21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,
ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ. 22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,
ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. 23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,
ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. 24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,
a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,
a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka. 25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha
si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.