Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.

Job 24:19 in English

Job 24:19 · Berean Standard Bible

As drought and heat consume the melting snow, so Sheol steals those who have sinned.

Context

17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. 19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. 20Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi. 21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.