Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.

Job 24:18 in English

Job 24:18 · Berean Standard Bible

They are but foam on the surface of the water; their portion of the land is cursed, so that no one turns toward their vineyards.

Context

16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. 19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. 20Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.