Job 24:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
Job 24:18 in English
Job 24:18 · Berean Standard Bible
They are but foam on the surface of the water; their portion of the land is cursed, so that no one turns toward their vineyards.
Context
16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,
nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha. 19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,
otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. 20Akpanwa na-echefu ha,
ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;
anaghị echetakwa ndị ajọọ omume
kama a na-etiji ha dịka osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.