Job 24:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
Job 24:16 in English
Job 24:16 · Berean Standard Bible
In the dark they dig through houses; by day they shut themselves in, never to experience the light.
Context
14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;
nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’
ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi. 18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,
nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.