Job 24:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
Job 24:15 in English
Job 24:15 · Berean Standard Bible
The eye of the adulterer watches for twilight. Thinking, ‘No eye will see me,’ he covers his face.
Context
13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
ndị na-amaghị ụzọ ya
maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. 14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;
nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’
ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ. 17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.