Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.

Job 24:14 in English

Job 24:14 · Berean Standard Bible

When daylight is gone, the murderer rises to kill the poor and needy; in the night he is like a thief.

Context

12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. 13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. 14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.