Job 24:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
Job 24:14 in English
Job 24:14 · Berean Standard Bible
When daylight is gone, the murderer rises to kill the poor and needy; in the night he is like a thief.
Context
12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.
Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. 13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
ndị na-amaghị ụzọ ya
maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya. 14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;
nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi. 15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’
ọ na-ekpuchikwa ihu ya. 16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.