Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.

Job 24:22 in English

Job 24:22 · Berean Standard Bible

Yet by His power, God drags away the mighty; though rising up, they have no assurance of life.

Context

20Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi. 21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ. 22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. 23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. 24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.