Job 24:23
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
Job 24:23 in English
Job 24:23 · Berean Standard Bible
He gives them a sense of security, but His eyes are on their ways.
Context
21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,
ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ. 22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,
ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ. 23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,
ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile. 24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,
a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,
a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka. 25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha
si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.