Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: 2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;
Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe. 3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?
Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị? 4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?
Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha? 5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,
ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya, 6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,
mmadụ, nke bụ naanị idide.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.