Job 24:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
Job 24:8 in English
Job 24:8 · Berean Standard Bible
Drenched by mountain rains, they huddle against the rocks for want of shelter.
Context
6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume. 7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi. 8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba. 9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe. 10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.