Job 24:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
Job 24:6 in English
Job 24:6 · Berean Standard Bible
They gather fodder in the fields and glean the vineyards of the wicked.
Context
4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. 5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,
ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri. 6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume. 7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi. 8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.