Job 24:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
Job 24:4 in English
Job 24:4 · Berean Standard Bible
They push the needy off the road and force all the poor of the land into hiding.
Context
2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi. 3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe. 4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. 5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,
ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri. 6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.