Job 24:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
Job 24:3 in English
Job 24:3 · Berean Standard Bible
They drive away the donkey of the fatherless and take the widow’s ox in pledge.
Context
1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?
Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a? 2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi. 3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe. 4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha. 5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,
ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.