Job 24:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
Job 24:11 in English
Job 24:11 · Berean Standard Bible
They crush olives within their walls; they tread the winepresses, but go thirsty.
Context
9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe. 10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ. 11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,
ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ. 12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.
Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a. 13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
ndị na-amaghị ụzọ ya
maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.