Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Job 23
1Mgbe ahụ, Job zara sị: 2“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m. 3A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya! 4Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m. 5Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m. 6Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo. 7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi. 8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya. 9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya. 10Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo, 11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe. 12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị. 13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya. 14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m. 15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya. 16Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji. 17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.