Job 23:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.
Job 23:15 in English
Job 23:15 · Berean Standard Bible
Therefore I am terrified in His presence; when I consider this, I fear Him.
Context
13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?
Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya. 14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,
ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m. 15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;
mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya. 16Chineke emeela ka obi m daa mba;
Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji. 17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,
bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.