Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

Job 23:13 in English

Job 23:13 · Berean Standard Bible

But He is unchangeable, and who can oppose Him? He does what He desires.

Context

11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe. 12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị. 13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya. 14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m. 15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.