Job 23:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.
Job 23:9 in English
Job 23:9 · Berean Standard Bible
When He is at work in the north, I cannot behold Him; when He turns to the south, I cannot see Him.
Context
7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.
Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi. 8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;
ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya. 9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,
mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya. 10Ma ọ maara ụzọ m na-aga,
mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo, 11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;
ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.