Native Bible

Hosea 4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Hosiya 4
1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo* megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.* 2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,* ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.* 8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu. 9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile. 10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee 11nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta. 12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. 13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. 14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’ 16Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara? 17Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya. 18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha. 19Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere. 4:1 Maọbụ, Onyenwe anyị akpọọla unu ikpe 4:1 Ịma ihe banyere Chineke adịghị nʼuche unu 4:2 Maọbụ, ịṅụ iyi 4:3 Maọbụ, na-anwụkwa anwụ 4:7 Ya bụ, ndị nchụaja 4:7 Akwụkwọ Masori na-ede, nsọpụrụ ha ka m gbanwere ka ọ ghọọ ihere

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.