Native Bible

Hosea 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.

Hosea 4:8 in English

Hosea 4:8 · Berean Standard Bible

They feed on the sins * of My people and set their hearts on iniquity.

Context

6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.* 8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu. 9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile. 10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.