Hosiya 4:7
Hosea 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.*
Hosea 4:7 in English
Hosea 4:7 · Berean Standard Bible
The more they multiplied, the more they sinned against Me; they exchanged their Glory * for a thing of disgrace.
Context
5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.
“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ,
otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,
ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.* 8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m.
Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu. 9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa.
Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ
ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.