Hosiya 4:5
Hosea 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
Hosea 4:5 in English
Hosea 4:5 · Berean Standard Bible
You will stumble by day, and the prophet will stumble with you by night; so I will destroy your mother—
Context
3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,*
ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.
Nʼihi na ndị gị dịka
ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.
“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ,
otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m,
ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.