Native Bible

Hosea 4:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.

Hosea 4:4 in English

Hosea 4:4 · Berean Standard Bible

But let no man contend; let no man offer reproof; for your people are like those who contend with a priest.*

Context

2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,* ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.