Hosiya 4:4
Hosea 4:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
Hosea 4:4 in English
Hosea 4:4 · Berean Standard Bible
But let no man contend; let no man offer reproof; for your people are like those who contend with a priest.*
Context
2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ,
izu ohi na ịkwa iko.
Ọgbaaghara dị nʼebe niile,
ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,*
ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.
Nʼihi na ndị gị dịka
ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị,
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ.
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe.
“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma,
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m;
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.