Hosiya 4:2
Hosea 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
Hosea 4:2 in English
Hosea 4:2 · Berean Standard Bible
Cursing and lying, murder and stealing, and adultery are rampant; one act of bloodshed follows another.
Context
1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel,
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo*
megide unu ndị bi nʼala a.
“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya,
ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.* 2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ,
izu ohi na ịkwa iko.
Ọgbaaghara dị nʼebe niile,
ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ,
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,*
ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe,
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu,
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo.
Nʼihi na ndị gị dịka
ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.