Native Bible

Hosea 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,* ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.

Hosea 4:3 in English

Hosea 4:3 · Berean Standard Bible

Therefore the land mourns, and all who dwell in it will waste away with the beasts of the field and the birds of the air; even the fish of the sea disappear.

Context

1Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo* megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.* 2Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,* ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 3Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,* ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.