Native Bible

Hosea 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.

Hosea 4:6 in English

Hosea 4:6 · Berean Standard Bible

My people are destroyed for lack of knowledge. Because you have rejected knowledge, I will also reject you as My priests. Since you have forgotten the law of your God, I will also forget your children.

Context

4“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 5Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 6ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 7Ka ha* na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.* 8Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.