Native Bible

Hosea 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’

Hosea 4:15 in English

Hosea 4:15 · Berean Standard Bible

Though you prostitute yourself, O Israel, may Judah avoid such guilt! Do not journey to Gilgal, do not go up to Beth-aven,* and do not swear on oath, ‘As surely as the LORD lives!’

Context

13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. 14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’ 16Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara? 17Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.