Hosiya 4:13
Hosea 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
Hosea 4:13 in English
Hosea 4:13 · Berean Standard Bible
They sacrifice on the mountaintops and burn offerings on the hills, under oak, poplar, and terebinth, because their shade is pleasant. And so your daughters turn to prostitution and your daughters-in-law to adultery.
Context
11nʼaka ịgba akwụna,
na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ,
nke na-ewepụ mmụọ nghọta. 12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme,
na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase.
Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo;
ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. 13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile,
na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile,
na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint,
ebe ndo ya dị ezi mma.
Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna,
ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. 14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,
mgbe ha na-agba akwụna,
maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ
mgbe ha na-akwa iko,
nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,
ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,
ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,
ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.
“Unu agakwala Gilgal,
unu agakwala ruo Bet-Aven,
unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.